Tuesday 17 February 2009

Obodo m

Kedu ihe m choro ikwu? Ogbapula m n'isi. Mba echetago m. Achoro m ikwu ihe gbasara obodo. Obodo juputara na miri ara na mmanu anu. Obodo Chukwu goziri nye ya ihe akuaku na ihe enwenwe. Obodo bara uba na mmadu ndi isi na-anu oku. Achoro m ikwu ihe gbasara obodo m. Obodo amuru m. Obodo nyere m ohere ka too buru mmadu. Obodo eji ama atu. Achoro m ikoro gi gbasara obodo m. Obodo na-eku ume di ka mmadu. Obodo ahu na-esighi ike. Obodo na-acho onye ga-enyere ya aka. Kedu ebe m ga-ebido? Obodo m taara ahuhu muo umu ma zuo umu ya. Umu ya were buru ndi na-emebi aha. Obi adighi obodo m mma. Obodo m na-acho onye ndu.
Obodo m na-acho onye enyemaka. Obodo m choro nzoputa. Ike agwugo ya iti mkpu maka umu ya aguu na-agu. Ike agwugo iti mkpu maka ego nri o debere umu nke izuru na-eri soso gi Obodo m na-ebe akwa ariri maka obi ojoo gi nke sitere na icho nani nke onwe gi. O bu na inweghi nti? Obodo m na-ebe akwa na-ebeku gi n'ihi na uzo agaghizi nime ya. Odachi dakwasiri obodo m riri ya onu nke mere na omaghi ebe o ga-ebido.
Umuaka amuru ohuru na anwu maka ogwu adighi n'ulo ogwu ma obodo m nyere ego a ga-eji gote onwu.
Umu ya ndi nwanyi na-anwu na oge omumu maka na onweghi akara ngwa eji amu nwa mana obodo nyere ego a ga-eji gote ya.
O tutu umu ya ahapula ya laa muo site n' ihe mberede nke okporo uzo maka na uzo adighi mma, ma leenu, obodo m nyere ego a ga-eji ruo uzo.
Otuto umu ya enweghi ulo mana obodo m nyere ego maka iru ulo.
Otutu etinyela aka n'ihe ojoo di iche iche. Ufodu bu ekperima, ndi ozo buru akwuna, ndi ozo baa naigwu ojoro 419.
Obodo m siiri na ndi okenye no n'ulo ewu a na-amu na ogbiri maka na akpiri ha di ogologo. ha na-acho naani nke one ha.

Bia gee nti ka inu akwa o na-ebe. O na inweghi ike inyere obodo m aka?
O putara na I nweghi ike I naputa aya n'aka ndi o so chi egbu kporo onwe ha ndi ndu mana ha bu ndi ochichi?
O putara na i pughi i chupu ndi O so chi egbu no na isi mmiri?
Cheemie echiche ofuma.
Mara na obodo m choro enye m aka gi
Nigeria choro enyemaka gi

2 comments:

  1. Agaba obi dim uto na ihe ina eme ebea. Ubochi m nwere ezigbo efe ka m neyere gi aka. Ihe mu na eme na na ebe mgabasa ozi m ka buru ibu. Inwe efe biko kpoturum na www.afrowall.com. obu m bu samson ebe ahu. Ngwa ka emesia

    ReplyDelete
  2. O di mma Sam a na m abia na afrowall.
    A ga m a bia hu gi anya.

    Jisie ike

    ReplyDelete