Wednesday 18 February 2009

Ehihie oma nu

A batara m e be ka m mara ka eke si anya anwu.
A mara m n'ihe niile na-agazi dika i si choo. Daalu. I cheekwala echiche maka obodo anyi Nigeria? O metukwala gi na obi icheputa ihe I ga-eme ka obodo di mma? I matara na obodo di rowdy ugbu a.

Onye o bula puta, O si na ndi isi ochichi na-achigbu anyi. Bia ma ajuo gi, ichere i no n'ime ulo gi na ewe iwe ga-eme ka obo di mma. mbanu! Ndi Igbo si na eze kpaa aru, ikpuru ekete kpuchie iru ma gwa ya. Ndi isi ochichi na-achigbu anyi ma na ichere na O dighi ihe I puru ime na O kwanu Onye ube ruru o rachaa dika Ukpabi Asika si kwuo. Nke ahu bu okwu ugha. Ihe okwesiri i bu bu, onye ube ruru o keere ya oha maka na O bu oha nyere ya ube.

Ya metukwanu gi na obi ka i nyere Nigeria aka. Isi ojii amaka. Nigeria ga-adi mma

No comments:

Post a Comment